Got a TV Licence?

You need one to watch live TV on any channel or device, and BBC programmes on iPlayer. It’s the law.

Find out more
I don’t have a TV Licence.

Akụkọ Na-abịa Ugbua

Oge niile edepụtara bụ UK

  1. Moderna akwụsịla atụmatụ iwube ụlọọrụ mmepụta ọgwụ mgbochi Covid na Kenya

    Covid-19

    Ụlọọrụ na-emepụta ọgwụ mgbochi coronavirus bụ Moderna akwụsịtụla atụmatụ iwube ụlọọrụ ya na Kenya.

    O nweburu atụmatụ ịmalite nkesa ọgwụ mgbochi Covid-19 na mba Afrịka n’ime afọ 2023 mana ugbua, Moderna na-ekwu na enwebeghị mba ọbụla dị n’ime Afrịka kpọrọla oku maka ọgwụ mgbochi kemgbe afọ 2022.

    Ụlọorụ ahụ kwuru na enweela nnukwu ịda mba banyere etu ndị mmadụ ji achọ ọgwụ mgbochi Covid-19 bụ nke mere o jiri nwee mkpebi ibelata ọnụọgụ ụlọọrụ ya iji belata oke mmefu.

    Moderna na-emefu ihe dịka $4.5 (£3.6) n’ime afọ a maka nchọcha na mmepụta ọgwụ mgbochi ndị ọhụrụ tinyere ọgwụ mgbochi maka HIV na ọrịa nriba ‘cancer’.

    Ezigbo uru dị n’ọgwụgwọ ọrịa ‘cancer’ bụ nke gụnyere ọtụtụ ọnụọgwụ maka onye ọrịa ọbụla karịa ọgwụ mgbochi coronavirus.

  2. Enweghi ndị a chọtara Covid-19 n'ahụ ha n'Ọwụwa-anyanwụ ụnyaahụ

    Mpaghara ọwụwa-anyanwụ eketeghi oke dịka a chọtara ọrịa covid-19 n’ahụ mmadụ iri abụọ na ise ọhụrụ ụnyaahụ.

    Ụlọọrụ NCDC wepụtara ọnụọgụgụ gosiri na ọ bụ na Legọs, Taraba, Kaduna, Rivas na Kwara ka a chọtara ndị bu ya bụ ọrịa.

    View more on twitter